Bitcoin ọ bụ ezigbo ụzọ ị ga-esi mụbaa ego gi? – BBC News Ìgbò
Bitcoin bụzi ihe onye ukwu na onye nta kpụ n’ọnụ taa gbasara okwu mmuba akụnụba nke Bekee kpọrọ ‘investment’. Onye ntorobịa ọbụla ị kpara aka n’ọnụ ugbua, ọ sị gị na ya etinyela ego ya na Bitcoin. Mana gịnị bụ Bitcoin? Bitcoin bụ ụdị ego anaghị ahụ anya; Bekee kpọrọ ya ‘Digital Currency’ maọbụ ‘Virtual Currency’ maọbụ ‘Cryptocurrency’.